IGBO E WEGHỊ EZE

Ọ bụrụ na Igbo e weghị eze,
Ị mara na Igbo e weghị olu
N’ala ndị eze –

Ọ bụrụ na Igbo e weghị eze,
Ị mara na Igbo e weghị oche
Na ọgbakọ ndi eze…

Igbo, tinye anya n’ime obi unu
Wee chọta eze unu
Wee ghọta eze unu
Wee jiri otu olu
Wee soro eze unu…

– Che Chidi Chukwumerije.

CHE KWU BE NWANNE-ECHI

Ndị na-ahụ ụzọ chọtara gị,
Ha chọtara gị bịa,
Ma ha ahụhụ gị –

Ngwa, gwa m ugbu a: olee ebe ị gara?
Ọkwọ a şi gị nọrọ n’ụlọ chere ha,
Hawa bụ ndi ji echi na-aka?
Ị jụ! Ị pụọ…!

Ngwa, lee nụ. Echi a chọrọla gị bịa,
Ma echi ahụhụ gị –
Nyiahụ a kpọchiela gị n’ime ụlọ ya.

Ndo.
Ndo.
Nke gị a gafeela…

– Che Chidi Chukwumerije.

Ị HỤ ỤZỌ

Ị chọọ ka anyị hụ ụzọ
Ị chaara m n’ụzọ, eee, ị chaara m n’ụzọ… –

Ị chaara m n’ụzọ, ọ bụrụ na
Ị meperela ọnwe gị ụzọ –

Ụzọ bụ nke m… ụzọ bụ nke gị… –
Bịa ka anyị chaara ọnwe anyị n’ụzọ,
Bịa ka anyị chịa ọchị ọzọ.

– Che Chidi Chukwumerije.

UDO KA

Udo ka
Udo echi
Maka
Ụwa taa
Bụ ụwa agha
Na ụwa mmebi.

– Che Chidi Chukwumerije.

UDO-ECHI

image

Obodo Chi
Obodo echi
Udo Chi
Ga a-bata echi

Chi ukwu
Chi na eke
Chi udo

Udo Chi
Ga a-bata echi

Mepee obi gị
Ka udo-echi
Bata n’ime obi gị
Ụbọchị taa.

– Che Chidi Chukwumerije.

MMIRI KEWARA ỤBỌCHỊ NA ANYASỊ

O nwe mmiri kewara
Ụbọchị na anyasị…
Nnukwu mmiri,
Ma o nweghị onye ma ụgbọ e ji
A ga fe ya…

Ị mechie anya
Ị fe pụ…
Ị mechie anya
Ị da ba…
Ị mechie anya
Ị kwụrụ n’oke mmiri ahụ kewara
Ụbọchị na anyasị…

Mgbe ụgbọmmiri ahụ na-ebu gị
Ọ nwee nnụnụ ị ga-anụ,
Nnụnụ na-agụ egwu, nwayọ nwayọ –

Echi, mgbe ị bili n’ụrǎ,
Ị gee nti, ị ga kwa anụ ọzọ
Mkpọtụ mmiri ahụ na olu nnụnụ ahụ
Nwayọ nwayọ n’ime obi ụwa ~

– Che Chidi Chukwumerije.

amazon cover copy mmiri a english 2015

ỤWA

amazon cover copy mmiri a english 2015
Anyị bịara ụwa
Maka gịnị?

Ọ nwe onye chụbara anyị ụwa?

Ọ nwe ihe chụpụ anyị n’Eligwe?

Otu ụbọchị, anyị bia…
Otu ụbọchị, anyị ga-ala…

Ma tupuu anyị a laa,
Ụwa ga e kuziri anyị ihe Chineke
Kenyere n’ime ya bụ ụwa

O nwere ihe anyị chọtara bịa ebe a
Onye nwụọ tupuu ọ chọta nke ya,
O ruo echi, ọ bịakwa ụwa ọzọ…

Ọ chọta nke ya, ọ la ma ulọ –
Maka ụwa bụ ụlọ akwukwọ…

– Che Chidi Chukwumerije.
amazon cover copy mmiri a deutsch 2015

ASỤSỤ MKPỤRỤ-OBI

Onye ọbụla sụọ Asụsụ nke ya,
Ọ bụ ịhe a gwara anyị –

Mana asụsụ dị abụọ…
E nwere asụsụ-ọnụ,
Nwere asụsụ-obi…

Asụsụ-ọnụ buru ibu,
Asụsụ-ọnu dị iche iche,
Asụsụ-ọnu bụ nani asụsụ-ọnụ…

Ma asụsụ-obi dị sọsọ otu…

Anyị nwe ọnụ, anyi nwere obi…
Sụpụta obi gị otu ị ji chọọ,
Ma ka ọbụrụ mkpụrụ-obi gị
Na-ekwu okwu.

– Che Chidi Chukwumerije.

ỤWA NWANNE

Mepee ntị, gee ntị…
Ịhụnanya na-agụ egwu
N’ime obi gị…

Anyị bụ otu –

– Che Chidi Chukwumerije.

N’IME MMIRI

amazon cover copy mmiri a english 2015
Ihe mere bụ na anyị echefuola nyiahụ –
Anyị chee na anyị
Ka na-echeta nyiahụ,
Ma anyị echefuola ya…

Okwute dabara n’ime mmiri,
Wee tie mpku, wee mechie ọnụ…

Anyị echefuola nyiahụ…

– Che Chidi Chukwumerije.
amazon cover copy mmiri a deutsch 2015