Loading…
Igbo
GWA ONWE GI EZIOKWU
Anyi ma ihe bu eziokwu
N’ime obi anyi –
Onweghi ihe obula ndi mmadu were ike ikwu
Wee ike ihichapu eziokwu ahu
Anyi na a hu
N’ime obi anyi –
Tupuu imechie anya n’abali
Meyee anya, lee eziokwu anya
N’ime obi gi
Maka n’ime ura, i ga a ro nro
N’ime nro i ga a hu ndi mmadu la ndi mmuo
Mana oburo ihenine ha ga e kwu
Ga a bu eziokwu…
I ma ihe bu eziokwu n’ime obi gi
Tupuu i meyee anya l’isi ututu
Mechie anya, nee eziokwu anya
n’ime obi gi
Maka tupuu chi e jie ozo
i ga e bi n’uwa, ruo oru n’uwa
Gwuo egwu n’uwa, kpagharia…
i ga e chefu onwe gi
Ma oge i ga echeta onwegi ozo n’abali
i ga a hu na i wogo onye ozo.
– Che Chidi Chukwumerije.
An Evening of Words – 7.4.19
Join the talented Philly Yambo and me on 7th April 2018, at 6pm, in Summa Summarum (Klappergasse 3, 60594 Frankfurt am Main). Poetry and Literature in English, German, Swahili and Igbo.
– Che Chidi Chukwumerije.
Ị MA IHE
Kedu ihe mere m nyịahụ?
Olee ebe m gara?
Kedu ihe m hụrụ?
A rịrị m ugwu? A bara m ọhịa ? E gwuru m mmiri?
A hụrụ m mmadụ? E gburu m anụ? A zara m mmụọ?
A maghị m…
E chefuola m…
Nanị otu ihe ka m ma ugbu a –
A ma m aha m.
– Che Chidi Chukwumerije.
Illustrated by Okam Abraxxzas
BỊA
ANYASỊ
Anyasị e rugo ọzọ,
Anyị a labaa…
Anyị e mechie anya…
Anyị e bilie…
Anyị a pụọ, anyị a gamie…
Anyasị e rugo ọzọ,
Anyị a lọta ụlọ…
—————–
Che Chidi Chukwumerije
—————–
ASỤSỤ
N’asụsụ ndị ọzọ
A jụrụ m enyi m ajụjụ –
Ọ za m…
M wee jụ kwa ya
Ajụjụ ahụ n’asụsụ m –
Ọ za m…
M wee ghọta na ọ weghị asụsụ abụọ
Bụ otu…,
Maka ihe enyi m zara m n’oge mbụ
A bụghị ihe ọ zara m n’oge abụọ…
– Che Chidi Chukwumerije.
OTU OBI
Ọ bụrụ na anya gị mepee
Ka ị wee hụ banye n’ime mkpụrụ-obi m,
A ma m na ị ga-ebe akwa…
A ma m na anya gị ga-agba anyammiri…
A ma m na obi gị ga-agba mmiri-obi…
Ma a ma kwa m na
Ị bee cha akwa,
Ị chịa ọchị ọzọ…
Eee, a ma m…
Ị ghọta ihe dị m na mkpụrụ-obi,
añụri e ju gị obi…,
Nwanne m, obi anyị nile bụ kwa nụ otu.
– Che Chidi Chukwumerije.
O NWE MMIRI NA-AGBA N’IME OBI
A nụrụ m olu n’ime abalị,
Mmadụ kpọrọ m aha…
A nụrụ m olu n’ime anyasị,
Mmụọ kpọrọ m aha…
A nụrụ m olu n’ime uchichi,
Chukwu gwara ha kpọọ m aha…
Mgbe m bili n’ụtụtụ,
Mmiri nọ na-ezo…
Nwayọ nwayọ ka mmiri a ji zoo…
O zoro nwayọ nwayọ…
Ma o wee di kwa m ka mmiri a na-akpọ kwa m aha.
Otu a ka ụbọchị m ji wee bido.
– Che Chidi Chukwumerije.
ỤTỤTỤ ỌMA
Mmiri…
Anyammiri…
Hicha Anyammiri,
Chi e foola…
Hicha Anyammiri
Na chi e foola…
Lee nụ ụwa nile –
Uwa nile e bilieela n’ụrǎ…
Gee ntị…
Gee ntị…
Gee ntị mma mma…
Ị nụrụ ya?
Ọchị ahụ, egwu ahụ,…
Ọ n’ime obi gị ka ha si a pụta.
Ngwa, hicha anyammiri, nwanne m,
Na chi e foo la…
– Che Chidi Chukwumerije.