ỤTỤTỤ ỌMA

Mmiri…
Anyammiri…
Hicha Anyammiri,
Chi e foola…

Hicha Anyammiri
Na chi e foola…

Lee nụ ụwa nile –
Uwa nile e bilieela n’ụrǎ…
Gee ntị…
Gee ntị…
Gee ntị mma mma…
Ị nụrụ ya?

Ọchị ahụ, egwu ahụ,…
Ọ n’ime obi gị ka ha si a pụta.

Ngwa, hicha anyammiri, nwanne m,
Na chi e foo la…

– Che Chidi Chukwumerije.

ATỊLANTIIKI

Nnukwu mmiri na a gba egwu
Onye na a kụụru gị ekwe
Na ogele?

Ahu a dịkwa gị mma?

A na m a jụ
Maka ị na e megharị ahụ
Dị ka onye nsogbu dị n’obi ya
N’ime abali.

Ọ bụ ọnwa na a chọ gị okwu?

– Che Chidi Chukwumerije.

IHE ỌHỤRỤ

Ị hụ ihe ọhụrụ, hapụ ya…
E gbu na ya…
E jide na ya…
Hapụ ya ka ọ gafere…
Hapụ ya ka ọ fepụrụ…
Hapụ ya ka ọ laa…

Ị hụ ihe ọhụrụ nọọrọ ọnwe ya,
Hapụ ya ka ọ nọrọ,
Hapụ ya aka.

– Che Chidi Chukwumerije.

IHE Ị NA-ACHỌ

Ị hụ ụzọ - drawing by Okam Abraxxzas

Kedu ihe ị na-achọ?
Ị ma?
Ị teta n’ụtụtụ…, ị rahụọ n’anyasị…
Kedu ebe ị na-aga?
Kedu ihe ị na-achọ?

Ị were anya tinye m n’anya… – !
Kedu ihe ị na-achọ n’anya m?
Kedu ihe ị na-achọ na mpkụrụ-obi m?
Kedu ihe ị na-achọ ebe nile?
Ị ma?

A ma m na ị maghị ihe ị na-achọ…
A ma m na ị maghị ihe ị na-achọ…
Mụ na gị, anyị abụọ ma na ị maghị ihe ị na-acho…
Ma chọ ba, chọ ba, chọ ba ya…
Chọ ba aha ihe ahụ ị na-achọ, nwanne m…

– Che Chidi Chukwumerije.

IGBO E WEGHỊ EZE

Ọ bụrụ na Igbo e weghị eze,
Ị mara na Igbo e weghị olu
N’ala ndị eze –

Ọ bụrụ na Igbo e weghị eze,
Ị mara na Igbo e weghị oche
Na ọgbakọ ndi eze…

Igbo, tinye anya n’ime obi unu
Wee chọta eze unu
Wee ghọta eze unu
Wee jiri otu olu
Wee soro eze unu…

– Che Chidi Chukwumerije.

CHE KWU BE NWANNE-ECHI

Ndị na-ahụ ụzọ chọtara gị,
Ha chọtara gị bịa,
Ma ha ahụhụ gị –

Ngwa, gwa m ugbu a: olee ebe ị gara?
Ọkwọ a şi gị nọrọ n’ụlọ chere ha,
Hawa bụ ndi ji echi na-aka?
Ị jụ! Ị pụọ…!

Ngwa, lee nụ. Echi a chọrọla gị bịa,
Ma echi ahụhụ gị –
Nyiahụ a kpọchiela gị n’ime ụlọ ya.

Ndo.
Ndo.
Nke gị a gafeela…

– Che Chidi Chukwumerije.

Ị HỤ ỤZỌ

Ị chọọ ka anyị hụ ụzọ
Ị chaara m n’ụzọ, eee, ị chaara m n’ụzọ… –

Ị chaara m n’ụzọ, ọ bụrụ na
Ị meperela ọnwe gị ụzọ –

Ụzọ bụ nke m… ụzọ bụ nke gị… –
Bịa ka anyị chaara ọnwe anyị n’ụzọ,
Bịa ka anyị chịa ọchị ọzọ.

– Che Chidi Chukwumerije.

UDO KA

Udo ka
Udo echi
Maka
Ụwa taa
Bụ ụwa agha
Na ụwa mmebi.

– Che Chidi Chukwumerije.

UDO-ECHI

image

Obodo Chi
Obodo echi
Udo Chi
Ga a-bata echi

Chi ukwu
Chi na eke
Chi udo

Udo Chi
Ga a-bata echi

Mepee obi gị
Ka udo-echi
Bata n’ime obi gị
Ụbọchị taa.

– Che Chidi Chukwumerije.

MMIRI KEWARA ỤBỌCHỊ NA ANYASỊ

O nwe mmiri kewara
Ụbọchị na anyasị…
Nnukwu mmiri,
Ma o nweghị onye ma ụgbọ e ji
A ga fe ya…

Ị mechie anya
Ị fe pụ…
Ị mechie anya
Ị da ba…
Ị mechie anya
Ị kwụrụ n’oke mmiri ahụ kewara
Ụbọchị na anyasị…

Mgbe ụgbọmmiri ahụ na-ebu gị
Ọ nwee nnụnụ ị ga-anụ,
Nnụnụ na-agụ egwu, nwayọ nwayọ –

Echi, mgbe ị bili n’ụrǎ,
Ị gee nti, ị ga kwa anụ ọzọ
Mkpọtụ mmiri ahụ na olu nnụnụ ahụ
Nwayọ nwayọ n’ime obi ụwa ~

– Che Chidi Chukwumerije.

amazon cover copy mmiri a english 2015