GWA ONWE GI EZIOKWU


Anyi ma ihe bu eziokwu
N’ime obi anyi –
Onweghi ihe obula ndi mmadu were ike ikwu
Wee ike ihichapu eziokwu ahu
Anyi na a hu
N’ime obi anyi –

Tupuu imechie anya n’abali
Meyee anya, lee eziokwu anya
N’ime obi gi

Maka n’ime ura, i ga a ro nro
N’ime nro i ga a hu ndi mmadu la ndi mmuo
Mana oburo ihenine ha ga e kwu
Ga a bu eziokwu…
I ma ihe bu eziokwu n’ime obi gi

Tupuu i meyee anya l’isi ututu
Mechie anya, nee eziokwu anya
n’ime obi gi

Maka tupuu chi e jie ozo
i ga e bi n’uwa, ruo oru n’uwa
Gwuo egwu n’uwa, kpagharia…
i ga e chefu onwe gi
Ma oge i ga echeta onwegi ozo n’abali
i ga a hu na i wogo onye ozo.

– Che Chidi Chukwumerije.

N’IME OBI

final image 1

E mechaa,
Mgbe anyasị ruru,
Anyị a gụọ egwu ahụ ọzọ –

Ọ egwu Chineke
Tinyere n’ime ụwa,
Egwu obi, egwu obi,
Egwu mkpụrụ-obi… –

Unu a jụna m
Ihe mere e ji m a gụpụta ihe dị m n’obi…
Unu a jụna m
Ihe mere e ji m a sụ nani asụsụ nke m…
Igbo bu otu, anyị ma,
Ma onye ọbụla nwe asụsụ bụ sọ nke ya,
Maka ọnye ọbụla dị iche –
Ị jụna m ihe mere e ji m a sụ asụsụ nke m –

Ma, ị chọọ,
Ị bịa mgbe anyasị ruru,
Mgbe ọnwa na-achị n’eligwe,
Mgbe ukuku na-ahwụ nwayọ kwa,
Ị bịa,
Ka anyị wee gụa egwu ahụ anyị nile ma,
Egwu ahụ Chineke tinyere m’ime ụwa,
Egwu ahụ Chineke tinyere anyị nịle n’ime obi,
Egwu eziokwu na ịhụnanya,
Egwu idinotu.

– Che Chidi Chukwumerije.

———————————————————
Che Chidi Chukwumerije – Mmiri a zoro nwayọ nwayọ (english / deutsch)
———————————————————-
illustrated by Okam Abraxxzas