ASỤSỤ MKPỤRỤ-OBI

Onye ọbụla sụọ Asụsụ nke ya,
Ọ bụ ịhe a gwara anyị –

Mana asụsụ dị abụọ…
E nwere asụsụ-ọnụ,
Nwere asụsụ-obi…

Asụsụ-ọnụ buru ibu,
Asụsụ-ọnu dị iche iche,
Asụsụ-ọnu bụ nani asụsụ-ọnụ…

Ma asụsụ-obi dị sọsọ otu…

Anyị nwe ọnụ, anyi nwere obi…
Sụpụta obi gị otu ị ji chọọ,
Ma ka ọbụrụ mkpụrụ-obi gị
Na-ekwu okwu.

– Che Chidi Chukwumerije.