ỤWA

amazon cover copy mmiri a english 2015
Anyị bịara ụwa
Maka gịnị?

Ọ nwe onye chụbara anyị ụwa?

Ọ nwe ihe chụpụ anyị n’Eligwe?

Otu ụbọchị, anyị bia…
Otu ụbọchị, anyị ga-ala…

Ma tupuu anyị a laa,
Ụwa ga e kuziri anyị ihe Chineke
Kenyere n’ime ya bụ ụwa

O nwere ihe anyị chọtara bịa ebe a
Onye nwụọ tupuu ọ chọta nke ya,
O ruo echi, ọ bịakwa ụwa ọzọ…

Ọ chọta nke ya, ọ la ma ulọ –
Maka ụwa bụ ụlọ akwukwọ…

– Che Chidi Chukwumerije.
amazon cover copy mmiri a deutsch 2015

ASỤSỤ MKPỤRỤ-OBI

Onye ọbụla sụọ Asụsụ nke ya,
Ọ bụ ịhe a gwara anyị –

Mana asụsụ dị abụọ…
E nwere asụsụ-ọnụ,
Nwere asụsụ-obi…

Asụsụ-ọnụ buru ibu,
Asụsụ-ọnu dị iche iche,
Asụsụ-ọnu bụ nani asụsụ-ọnụ…

Ma asụsụ-obi dị sọsọ otu…

Anyị nwe ọnụ, anyi nwere obi…
Sụpụta obi gị otu ị ji chọọ,
Ma ka ọbụrụ mkpụrụ-obi gị
Na-ekwu okwu.

– Che Chidi Chukwumerije.

START

If you decide, and start
To do nothing
Your gods will help you to
To nothing.

If you decide, and start
To do something
Your gods will help you to
Do something.

Onye kwe
Chi ya e kwe!
*

Nature will strengthen the fruits
Of the seeds you sow and grow.

– Che Chidi Chukwumerije.

————
* Igbo proverb: “If you say yes, your god will also say yes.”

ỤWA NWANNE

Mepee ntị, gee ntị…
Ịhụnanya na-agụ egwu
N’ime obi gị…

Anyị bụ otu –

– Che Chidi Chukwumerije.

N’IME MMIRI

amazon cover copy mmiri a english 2015
Ihe mere bụ na anyị echefuola nyiahụ –
Anyị chee na anyị
Ka na-echeta nyiahụ,
Ma anyị echefuola ya…

Okwute dabara n’ime mmiri,
Wee tie mpku, wee mechie ọnụ…

Anyị echefuola nyiahụ…

– Che Chidi Chukwumerije.
amazon cover copy mmiri a deutsch 2015

N’IME OBI

final image 1

E mechaa,
Mgbe anyasị ruru,
Anyị a gụọ egwu ahụ ọzọ –

Ọ egwu Chineke
Tinyere n’ime ụwa,
Egwu obi, egwu obi,
Egwu mkpụrụ-obi… –

Unu a jụna m
Ihe mere e ji m a gụpụta ihe dị m n’obi…
Unu a jụna m
Ihe mere e ji m a sụ nani asụsụ nke m…
Igbo bu otu, anyị ma,
Ma onye ọbụla nwe asụsụ bụ sọ nke ya,
Maka ọnye ọbụla dị iche –
Ị jụna m ihe mere e ji m a sụ asụsụ nke m –

Ma, ị chọọ,
Ị bịa mgbe anyasị ruru,
Mgbe ọnwa na-achị n’eligwe,
Mgbe ukuku na-ahwụ nwayọ kwa,
Ị bịa,
Ka anyị wee gụa egwu ahụ anyị nile ma,
Egwu ahụ Chineke tinyere m’ime ụwa,
Egwu ahụ Chineke tinyere anyị nịle n’ime obi,
Egwu eziokwu na ịhụnanya,
Egwu idinotu.

– Che Chidi Chukwumerije.

———————————————————
Che Chidi Chukwumerije – Mmiri a zoro nwayọ nwayọ (english / deutsch)
———————————————————-
illustrated by Okam Abraxxzas