N’asụsụ ndị ọzọ
A jụrụ m enyi m ajụjụ –
Ọ za m…
M wee jụ kwa ya
Ajụjụ ahụ n’asụsụ m –
Ọ za m…
M wee ghọta na ọ weghị asụsụ abụọ
Bụ otu…,
Maka ihe enyi m zara m n’oge mbụ
A bụghị ihe ọ zara m n’oge abụọ…
– Che Chidi Chukwumerije.
N’asụsụ ndị ọzọ
A jụrụ m enyi m ajụjụ –
Ọ za m…
M wee jụ kwa ya
Ajụjụ ahụ n’asụsụ m –
Ọ za m…
M wee ghọta na ọ weghị asụsụ abụọ
Bụ otu…,
Maka ihe enyi m zara m n’oge mbụ
A bụghị ihe ọ zara m n’oge abụọ…
– Che Chidi Chukwumerije.
Onye ọbụla sụọ Asụsụ nke ya,
Ọ bụ ịhe a gwara anyị –
Mana asụsụ dị abụọ…
E nwere asụsụ-ọnụ,
Nwere asụsụ-obi…
Asụsụ-ọnụ buru ibu,
Asụsụ-ọnu dị iche iche,
Asụsụ-ọnu bụ nani asụsụ-ọnụ…
Ma asụsụ-obi dị sọsọ otu…
Anyị nwe ọnụ, anyi nwere obi…
Sụpụta obi gị otu ị ji chọọ,
Ma ka ọbụrụ mkpụrụ-obi gị
Na-ekwu okwu.
– Che Chidi Chukwumerije.
E mechaa,
Mgbe anyasị ruru,
Anyị a gụọ egwu ahụ ọzọ –
Ọ egwu Chineke
Tinyere n’ime ụwa,
Egwu obi, egwu obi,
Egwu mkpụrụ-obi… –
Unu a jụna m
Ihe mere e ji m a gụpụta ihe dị m n’obi…
Unu a jụna m
Ihe mere e ji m a sụ nani asụsụ nke m…
Igbo bu otu, anyị ma,
Ma onye ọbụla nwe asụsụ bụ sọ nke ya,
Maka ọnye ọbụla dị iche –
Ị jụna m ihe mere e ji m a sụ asụsụ nke m –
Ma, ị chọọ,
Ị bịa mgbe anyasị ruru,
Mgbe ọnwa na-achị n’eligwe,
Mgbe ukuku na-ahwụ nwayọ kwa,
Ị bịa,
Ka anyị wee gụa egwu ahụ anyị nile ma,
Egwu ahụ Chineke tinyere m’ime ụwa,
Egwu ahụ Chineke tinyere anyị nịle n’ime obi,
Egwu eziokwu na ịhụnanya,
Egwu idinotu.
– Che Chidi Chukwumerije.
———————————————————
Che Chidi Chukwumerije – Mmiri a zoro nwayọ nwayọ (english / deutsch)
———————————————————-
illustrated by Okam Abraxxzas