OTU OBI

Ọ bụrụ na anya gị mepee
Ka ị wee hụ banye n’ime mkpụrụ-obi m,
A ma m na ị ga-ebe akwa…
A ma m na anya gị ga-agba anyammiri…
A ma m na obi gị ga-agba mmiri-obi…

Ma a ma kwa m na
Ị bee cha akwa,
Ị chịa ọchị ọzọ…

Eee, a ma m…
Ị ghọta ihe dị m na mkpụrụ-obi,
añụri e ju gị obi…,
Nwanne m, obi anyị nile bụ kwa nụ otu.

Che Chidi Chukwumerije.

IHE Ị NA-ACHỌ

Ị hụ ụzọ - drawing by Okam Abraxxzas

Kedu ihe ị na-achọ?
Ị ma?
Ị teta n’ụtụtụ…, ị rahụọ n’anyasị…
Kedu ebe ị na-aga?
Kedu ihe ị na-achọ?

Ị were anya tinye m n’anya… – !
Kedu ihe ị na-achọ n’anya m?
Kedu ihe ị na-achọ na mpkụrụ-obi m?
Kedu ihe ị na-achọ ebe nile?
Ị ma?

A ma m na ị maghị ihe ị na-achọ…
A ma m na ị maghị ihe ị na-achọ…
Mụ na gị, anyị abụọ ma na ị maghị ihe ị na-acho…
Ma chọ ba, chọ ba, chọ ba ya…
Chọ ba aha ihe ahụ ị na-achọ, nwanne m…

Che Chidi Chukwumerije.

Ị HỤ ỤZỌ

Ị chọọ ka anyị hụ ụzọ
Ị chaara m n’ụzọ, eee, ị chaara m n’ụzọ… –

Ị chaara m n’ụzọ, ọ bụrụ na
Ị meperela ọnwe gị ụzọ –

Ụzọ bụ nke m… ụzọ bụ nke gị… –
Bịa ka anyị chaara ọnwe anyị n’ụzọ,
Bịa ka anyị chịa ọchị ọzọ.

Che Chidi Chukwumerije.