Ị MA IHE

final image 4

Kedu ihe mere m nyịahụ?
Olee ebe m gara?
Kedu ihe m hụrụ?
A rịrị m ugwu? A bara m ọhịa ? E gwuru m mmiri?
A hụrụ m mmadụ? E gburu m anụ? A zara m mmụọ?
A maghị m…
E chefuola m…
Nanị otu ihe ka m ma ugbu a –
A ma m aha m.

– Che Chidi Chukwumerije.
Illustrated by Okam Abraxxzas

ATỊLANTIIKI

Nnukwu mmiri na a gba egwu
Onye na a kụụru gị ekwe
Na ogele?

Ahu a dịkwa gị mma?

A na m a jụ
Maka ị na e megharị ahụ
Dị ka onye nsogbu dị n’obi ya
N’ime abali.

Ọ bụ ọnwa na a chọ gị okwu?

Che Chidi Chukwumerije.

MMIRI KEWARA ỤBỌCHỊ NA ANYASỊ

O nwe mmiri kewara
Ụbọchị na anyasị…
Nnukwu mmiri,
Ma o nweghị onye ma ụgbọ e ji
A ga fe ya…

Ị mechie anya
Ị fe pụ…
Ị mechie anya
Ị da ba…
Ị mechie anya
Ị kwụrụ n’oke mmiri ahụ kewara
Ụbọchị na anyasị…

Mgbe ụgbọmmiri ahụ na-ebu gị
Ọ nwee nnụnụ ị ga-anụ,
Nnụnụ na-agụ egwu, nwayọ nwayọ –

Echi, mgbe ị bili n’ụrǎ,
Ị gee nti, ị ga kwa anụ ọzọ
Mkpọtụ mmiri ahụ na olu nnụnụ ahụ
Nwayọ nwayọ n’ime obi ụwa ~

– Che Chidi Chukwumerije.

amazon cover copy mmiri a english 2015

N’IME MMIRI

amazon cover copy mmiri a english 2015
Ihe mere bụ na anyị echefuola nyiahụ –
Anyị chee na anyị
Ka na-echeta nyiahụ,
Ma anyị echefuola ya…

Okwute dabara n’ime mmiri,
Wee tie mpku, wee mechie ọnụ…

Anyị echefuola nyiahụ…

– Che Chidi Chukwumerije.
amazon cover copy mmiri a deutsch 2015