BOYS TO MEN

The older I get,
The more I miss my father.
The more knowing I grow,
The more I miss him.
The more I know him.
The more I understand him.
We live life forwards,
But understand life backwards.
When it‘s too late to change anything,
That’s when we understand everything.
The young shall grow.

– Che Chidi Chukwumerije
(I just feel like remembering today)

Ị MA IHE

final image 4

Kedu ihe mere m nyịahụ?
Olee ebe m gara?
Kedu ihe m hụrụ?
A rịrị m ugwu? A bara m ọhịa ? E gwuru m mmiri?
A hụrụ m mmadụ? E gburu m anụ? A zara m mmụọ?
A maghị m…
E chefuola m…
Nanị otu ihe ka m ma ugbu a –
A ma m aha m.

– Che Chidi Chukwumerije.
Illustrated by Okam Abraxxzas

BỊA

Ị hụ ụzọ - drawing by Okam Abraxxzas

M wee kpọọ gị aha,
M wee sị aha gị lọta,
Aha gị wee lọta –
Aha gị wee buru gị n’isi.
Wee kpọrọ gị n’aka
Wee lọta.

– Che Chidi Chukwumerije.

ANYASỊ

Anyasị e rugo ọzọ,
Anyị a labaa…
Anyị e mechie anya…
Anyị e bilie…
Anyị a pụọ, anyị a gamie…

Anyasị e rugo ọzọ,
Anyị a lọta ụlọ…

—————–
Che Chidi Chukwumerije
—————–

ASỤSỤ

N’asụsụ ndị ọzọ
A jụrụ m enyi m ajụjụ –
Ọ za m…

M wee jụ kwa ya
Ajụjụ ahụ n’asụsụ m –
Ọ za m…

M wee ghọta na ọ weghị asụsụ abụọ
Bụ otu…,
Maka ihe enyi m zara m n’oge mbụ
A bụghị ihe ọ zara m n’oge abụọ…

Che Chidi Chukwumerije.

OTU OBI

Ọ bụrụ na anya gị mepee
Ka ị wee hụ banye n’ime mkpụrụ-obi m,
A ma m na ị ga-ebe akwa…
A ma m na anya gị ga-agba anyammiri…
A ma m na obi gị ga-agba mmiri-obi…

Ma a ma kwa m na
Ị bee cha akwa,
Ị chịa ọchị ọzọ…

Eee, a ma m…
Ị ghọta ihe dị m na mkpụrụ-obi,
añụri e ju gị obi…,
Nwanne m, obi anyị nile bụ kwa nụ otu.

Che Chidi Chukwumerije.

O NWE MMIRI NA-AGBA N’IME OBI

amazon cover copy mmiri a english 2015     amazon cover copy mmiri a deutsch 2015

A nụrụ m olu n’ime abalị,
Mmadụ kpọrọ m aha…

A nụrụ m olu n’ime anyasị,
Mmụọ kpọrọ m aha…

A nụrụ m olu n’ime uchichi,
Chukwu gwara ha kpọọ m aha…

Mgbe m bili n’ụtụtụ,
Mmiri nọ na-ezo…
Nwayọ nwayọ ka mmiri a ji zoo…
O zoro nwayọ nwayọ…

Ma o wee di kwa m ka mmiri a na-akpọ kwa m aha.

Otu a ka ụbọchị m ji wee bido.

Che Chidi Chukwumerije.

ỤTỤTỤ ỌMA

Mmiri…
Anyammiri…
Hicha Anyammiri,
Chi e foola…

Hicha Anyammiri
Na chi e foola…

Lee nụ ụwa nile –
Uwa nile e bilieela n’ụrǎ…
Gee ntị…
Gee ntị…
Gee ntị mma mma…
Ị nụrụ ya?

Ọchị ahụ, egwu ahụ,…
Ọ n’ime obi gị ka ha si a pụta.

Ngwa, hicha anyammiri, nwanne m,
Na chi e foo la…

Che Chidi Chukwumerije.

IHE ỌHỤRỤ

Ị hụ ihe ọhụrụ, hapụ ya…
E gbu na ya…
E jide na ya…
Hapụ ya ka ọ gafere…
Hapụ ya ka ọ fepụrụ…
Hapụ ya ka ọ laa…

Ị hụ ihe ọhụrụ nọọrọ ọnwe ya,
Hapụ ya ka ọ nọrọ,
Hapụ ya aka.

Che Chidi Chukwumerije.

IGBO E WEGHỊ EZE

Ọ bụrụ na Igbo e weghị eze,
Ị mara na Igbo e weghị olu
N’ala ndị eze –

Ọ bụrụ na Igbo e weghị eze,
Ị mara na Igbo e weghị oche
Na ọgbakọ ndi eze…

Igbo, tinye anya n’ime obi unu
Wee chọta eze unu
Wee ghọta eze unu
Wee jiri otu olu
Wee soro eze unu…

Che Chidi Chukwumerije.