BOYS TO MEN

The older I get,
The more I miss my father.
The more knowing I grow,
The more I miss him.
The more I know him.
The more I understand him.
We live life forwards,
But understand life backwards.
When it‘s too late to change anything,
That’s when we understand everything.
The young shall grow.

– Che Chidi Chukwumerije
(I just feel like remembering today)

Ị MA IHE

final image 4

Kedu ihe mere m nyịahụ?
Olee ebe m gara?
Kedu ihe m hụrụ?
A rịrị m ugwu? A bara m ọhịa ? E gwuru m mmiri?
A hụrụ m mmadụ? E gburu m anụ? A zara m mmụọ?
A maghị m…
E chefuola m…
Nanị otu ihe ka m ma ugbu a –
A ma m aha m.

– Che Chidi Chukwumerije.
Illustrated by Okam Abraxxzas

BỊA

Ị hụ ụzọ - drawing by Okam Abraxxzas

M wee kpọọ gị aha,
M wee sị aha gị lọta,
Aha gị wee lọta –
Aha gị wee buru gị n’isi.
Wee kpọrọ gị n’aka
Wee lọta.

– Che Chidi Chukwumerije.

ANYASỊ

Anyasị e rugo ọzọ,
Anyị a labaa…
Anyị e mechie anya…
Anyị e bilie…
Anyị a pụọ, anyị a gamie…

Anyasị e rugo ọzọ,
Anyị a lọta ụlọ…

—————–
Che Chidi Chukwumerije
—————–

ASỤSỤ

N’asụsụ ndị ọzọ
A jụrụ m enyi m ajụjụ –
Ọ za m…

M wee jụ kwa ya
Ajụjụ ahụ n’asụsụ m –
Ọ za m…

M wee ghọta na ọ weghị asụsụ abụọ
Bụ otu…,
Maka ihe enyi m zara m n’oge mbụ
A bụghị ihe ọ zara m n’oge abụọ…

– Che Chidi Chukwumerije.

OTU OBI

Ọ bụrụ na anya gị mepee
Ka ị wee hụ banye n’ime mkpụrụ-obi m,
A ma m na ị ga-ebe akwa…
A ma m na anya gị ga-agba anyammiri…
A ma m na obi gị ga-agba mmiri-obi…

Ma a ma kwa m na
Ị bee cha akwa,
Ị chịa ọchị ọzọ…

Eee, a ma m…
Ị ghọta ihe dị m na mkpụrụ-obi,
añụri e ju gị obi…,
Nwanne m, obi anyị nile bụ kwa nụ otu.

– Che Chidi Chukwumerije.

O NWE MMIRI NA-AGBA N’IME OBI

amazon cover copy mmiri a english 2015     amazon cover copy mmiri a deutsch 2015

A nụrụ m olu n’ime abalị,
Mmadụ kpọrọ m aha…

A nụrụ m olu n’ime anyasị,
Mmụọ kpọrọ m aha…

A nụrụ m olu n’ime uchichi,
Chukwu gwara ha kpọọ m aha…

Mgbe m bili n’ụtụtụ,
Mmiri nọ na-ezo…
Nwayọ nwayọ ka mmiri a ji zoo…
O zoro nwayọ nwayọ…

Ma o wee di kwa m ka mmiri a na-akpọ kwa m aha.

Otu a ka ụbọchị m ji wee bido.

– Che Chidi Chukwumerije.

ỤTỤTỤ ỌMA

Mmiri…
Anyammiri…
Hicha Anyammiri,
Chi e foola…

Hicha Anyammiri
Na chi e foola…

Lee nụ ụwa nile –
Uwa nile e bilieela n’ụrǎ…
Gee ntị…
Gee ntị…
Gee ntị mma mma…
Ị nụrụ ya?

Ọchị ahụ, egwu ahụ,…
Ọ n’ime obi gị ka ha si a pụta.

Ngwa, hicha anyammiri, nwanne m,
Na chi e foo la…

– Che Chidi Chukwumerije.

IHE ỌHỤRỤ

Ị hụ ihe ọhụrụ, hapụ ya…
E gbu na ya…
E jide na ya…
Hapụ ya ka ọ gafere…
Hapụ ya ka ọ fepụrụ…
Hapụ ya ka ọ laa…

Ị hụ ihe ọhụrụ nọọrọ ọnwe ya,
Hapụ ya ka ọ nọrọ,
Hapụ ya aka.

– Che Chidi Chukwumerije.

IGBO E WEGHỊ EZE

Ọ bụrụ na Igbo e weghị eze,
Ị mara na Igbo e weghị olu
N’ala ndị eze –

Ọ bụrụ na Igbo e weghị eze,
Ị mara na Igbo e weghị oche
Na ọgbakọ ndi eze…

Igbo, tinye anya n’ime obi unu
Wee chọta eze unu
Wee ghọta eze unu
Wee jiri otu olu
Wee soro eze unu…

– Che Chidi Chukwumerije.