N’asụsụ ndị ọzọ
A jụrụ m enyi m ajụjụ –
Ọ za m…
M wee jụ kwa ya
Ajụjụ ahụ n’asụsụ m –
Ọ za m…
M wee ghọta na ọ weghị asụsụ abụọ
Bụ otu…,
Maka ihe enyi m zara m n’oge mbụ
A bụghị ihe ọ zara m n’oge abụọ…
– Che Chidi Chukwumerije.
N’asụsụ ndị ọzọ
A jụrụ m enyi m ajụjụ –
Ọ za m…
M wee jụ kwa ya
Ajụjụ ahụ n’asụsụ m –
Ọ za m…
M wee ghọta na ọ weghị asụsụ abụọ
Bụ otu…,
Maka ihe enyi m zara m n’oge mbụ
A bụghị ihe ọ zara m n’oge abụọ…
– Che Chidi Chukwumerije.
Ọ bụrụ na anya gị mepee
Ka ị wee hụ banye n’ime mkpụrụ-obi m,
A ma m na ị ga-ebe akwa…
A ma m na anya gị ga-agba anyammiri…
A ma m na obi gị ga-agba mmiri-obi…
Ma a ma kwa m na
Ị bee cha akwa,
Ị chịa ọchị ọzọ…
Eee, a ma m…
Ị ghọta ihe dị m na mkpụrụ-obi,
añụri e ju gị obi…,
Nwanne m, obi anyị nile bụ kwa nụ otu.
– Che Chidi Chukwumerije.
A nụrụ m olu n’ime abalị,
Mmadụ kpọrọ m aha…
A nụrụ m olu n’ime anyasị,
Mmụọ kpọrọ m aha…
A nụrụ m olu n’ime uchichi,
Chukwu gwara ha kpọọ m aha…
Mgbe m bili n’ụtụtụ,
Mmiri nọ na-ezo…
Nwayọ nwayọ ka mmiri a ji zoo…
O zoro nwayọ nwayọ…
Ma o wee di kwa m ka mmiri a na-akpọ kwa m aha.
Otu a ka ụbọchị m ji wee bido.
– Che Chidi Chukwumerije.
Ị hụ ihe ọhụrụ, hapụ ya…
E gbu na ya…
E jide na ya…
Hapụ ya ka ọ gafere…
Hapụ ya ka ọ fepụrụ…
Hapụ ya ka ọ laa…
Ị hụ ihe ọhụrụ nọọrọ ọnwe ya,
Hapụ ya ka ọ nọrọ,
Hapụ ya aka.
– Che Chidi Chukwumerije.
Kedu ihe ị na-achọ?
Ị ma?
Ị teta n’ụtụtụ…, ị rahụọ n’anyasị…
Kedu ebe ị na-aga?
Kedu ihe ị na-achọ?
Ị were anya tinye m n’anya… – !
Kedu ihe ị na-achọ n’anya m?
Kedu ihe ị na-achọ na mpkụrụ-obi m?
Kedu ihe ị na-achọ ebe nile?
Ị ma?
A ma m na ị maghị ihe ị na-achọ…
A ma m na ị maghị ihe ị na-achọ…
Mụ na gị, anyị abụọ ma na ị maghị ihe ị na-acho…
Ma chọ ba, chọ ba, chọ ba ya…
Chọ ba aha ihe ahụ ị na-achọ, nwanne m…
– Che Chidi Chukwumerije.
Ọ bụrụ na Igbo e weghị eze,
Ị mara na Igbo e weghị olu
N’ala ndị eze –
Ọ bụrụ na Igbo e weghị eze,
Ị mara na Igbo e weghị oche
Na ọgbakọ ndi eze…
Igbo, tinye anya n’ime obi unu
Wee chọta eze unu
Wee ghọta eze unu
Wee jiri otu olu
Wee soro eze unu…
– Che Chidi Chukwumerije.
Ndị na-ahụ ụzọ chọtara gị,
Ha chọtara gị bịa,
Ma ha ahụhụ gị –
Ngwa, gwa m ugbu a: olee ebe ị gara?
Ọkwọ a şi gị nọrọ n’ụlọ chere ha,
Hawa bụ ndi ji echi na-aka?
Ị jụ! Ị pụọ…!
Ngwa, lee nụ. Echi a chọrọla gị bịa,
Ma echi ahụhụ gị –
Nyiahụ a kpọchiela gị n’ime ụlọ ya.
Ndo.
Ndo.
Nke gị a gafeela…
– Che Chidi Chukwumerije.
Ị chọọ ka anyị hụ ụzọ
Ị chaara m n’ụzọ, eee, ị chaara m n’ụzọ… –
Ị chaara m n’ụzọ, ọ bụrụ na
Ị meperela ọnwe gị ụzọ –
Ụzọ bụ nke m… ụzọ bụ nke gị… –
Bịa ka anyị chaara ọnwe anyị n’ụzọ,
Bịa ka anyị chịa ọchị ọzọ.
– Che Chidi Chukwumerije.