ASỤSỤ

N’asụsụ ndị ọzọ
A jụrụ m enyi m ajụjụ –
Ọ za m…

M wee jụ kwa ya
Ajụjụ ahụ n’asụsụ m –
Ọ za m…

M wee ghọta na ọ weghị asụsụ abụọ
Bụ otu…,
Maka ihe enyi m zara m n’oge mbụ
A bụghị ihe ọ zara m n’oge abụọ…

– Che Chidi Chukwumerije.

OTU OBI

Ọ bụrụ na anya gị mepee
Ka ị wee hụ banye n’ime mkpụrụ-obi m,
A ma m na ị ga-ebe akwa…
A ma m na anya gị ga-agba anyammiri…
A ma m na obi gị ga-agba mmiri-obi…

Ma a ma kwa m na
Ị bee cha akwa,
Ị chịa ọchị ọzọ…

Eee, a ma m…
Ị ghọta ihe dị m na mkpụrụ-obi,
añụri e ju gị obi…,
Nwanne m, obi anyị nile bụ kwa nụ otu.

– Che Chidi Chukwumerije.

O NWE MMIRI NA-AGBA N’IME OBI

amazon cover copy mmiri a english 2015     amazon cover copy mmiri a deutsch 2015

A nụrụ m olu n’ime abalị,
Mmadụ kpọrọ m aha…

A nụrụ m olu n’ime anyasị,
Mmụọ kpọrọ m aha…

A nụrụ m olu n’ime uchichi,
Chukwu gwara ha kpọọ m aha…

Mgbe m bili n’ụtụtụ,
Mmiri nọ na-ezo…
Nwayọ nwayọ ka mmiri a ji zoo…
O zoro nwayọ nwayọ…

Ma o wee di kwa m ka mmiri a na-akpọ kwa m aha.

Otu a ka ụbọchị m ji wee bido.

– Che Chidi Chukwumerije.

IHE ỌHỤRỤ

Ị hụ ihe ọhụrụ, hapụ ya…
E gbu na ya…
E jide na ya…
Hapụ ya ka ọ gafere…
Hapụ ya ka ọ fepụrụ…
Hapụ ya ka ọ laa…

Ị hụ ihe ọhụrụ nọọrọ ọnwe ya,
Hapụ ya ka ọ nọrọ,
Hapụ ya aka.

– Che Chidi Chukwumerije.

IHE Ị NA-ACHỌ

Ị hụ ụzọ - drawing by Okam Abraxxzas

Kedu ihe ị na-achọ?
Ị ma?
Ị teta n’ụtụtụ…, ị rahụọ n’anyasị…
Kedu ebe ị na-aga?
Kedu ihe ị na-achọ?

Ị were anya tinye m n’anya… – !
Kedu ihe ị na-achọ n’anya m?
Kedu ihe ị na-achọ na mpkụrụ-obi m?
Kedu ihe ị na-achọ ebe nile?
Ị ma?

A ma m na ị maghị ihe ị na-achọ…
A ma m na ị maghị ihe ị na-achọ…
Mụ na gị, anyị abụọ ma na ị maghị ihe ị na-acho…
Ma chọ ba, chọ ba, chọ ba ya…
Chọ ba aha ihe ahụ ị na-achọ, nwanne m…

– Che Chidi Chukwumerije.

IGBO E WEGHỊ EZE

Ọ bụrụ na Igbo e weghị eze,
Ị mara na Igbo e weghị olu
N’ala ndị eze –

Ọ bụrụ na Igbo e weghị eze,
Ị mara na Igbo e weghị oche
Na ọgbakọ ndi eze…

Igbo, tinye anya n’ime obi unu
Wee chọta eze unu
Wee ghọta eze unu
Wee jiri otu olu
Wee soro eze unu…

– Che Chidi Chukwumerije.

CHE KWU BE NWANNE-ECHI

Ndị na-ahụ ụzọ chọtara gị,
Ha chọtara gị bịa,
Ma ha ahụhụ gị –

Ngwa, gwa m ugbu a: olee ebe ị gara?
Ọkwọ a şi gị nọrọ n’ụlọ chere ha,
Hawa bụ ndi ji echi na-aka?
Ị jụ! Ị pụọ…!

Ngwa, lee nụ. Echi a chọrọla gị bịa,
Ma echi ahụhụ gị –
Nyiahụ a kpọchiela gị n’ime ụlọ ya.

Ndo.
Ndo.
Nke gị a gafeela…

– Che Chidi Chukwumerije.

Ị HỤ ỤZỌ

Ị chọọ ka anyị hụ ụzọ
Ị chaara m n’ụzọ, eee, ị chaara m n’ụzọ… –

Ị chaara m n’ụzọ, ọ bụrụ na
Ị meperela ọnwe gị ụzọ –

Ụzọ bụ nke m… ụzọ bụ nke gị… –
Bịa ka anyị chaara ọnwe anyị n’ụzọ,
Bịa ka anyị chịa ọchị ọzọ.

– Che Chidi Chukwumerije.